Jeremaya 43

Ya mere, ha nupuru isi nʼebe Onyenwe anyị nọ site nʼịbanye ala Ijipt. Ha jegidere ije ruo nʼobodo Tapanhis.

Jeremiah 43:7 (UKJV) So they came into the land of Egypt: for they obeyed not the voice of the LORD: thus came they even to Tahpanhes.

5Kama Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ, duuru ndị ahụ fọdụrụ na Juda pụọ, ha na ndị ahụ si na mba ndị ọzọ dị iche iche, ebe ha gbagara lọta.

6Ha duuru ndị ikom niile na ndị inyom niile na ụmụntakịrị niile, na ụmụ ndị inyom eze niile, bụ ndị ahụ Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze Babilọn tinyere na nlekọta Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan na Jeremaya onye amụma na Baruk nwa Neraya.

7Ya mere, ha nupuru isi nʼebe Onyenwe anyị nọ site nʼịbanye ala Ijipt. Ha jegidere ije ruo nʼobodo Tapanhis.

8Mgbe ha nọ na Tapanhis, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,

9“Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.