Jeremaya 43

“Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis.

Jeremiah 43:9 (UKJV) Take great stones in yours hand, and hide them in the clay in the brick-kiln, which is at the entry of Pharaoh's house in Tahpanhes, in the sight of the men of Judah;

7Ya mere, ha nupuru isi nʼebe Onyenwe anyị nọ site nʼịbanye ala Ijipt. Ha jegidere ije ruo nʼobodo Tapanhis.

8Mgbe ha nọ na Tapanhis, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,

9“Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis.

10Mgbe ahụ sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel sịrị, Aga m ezi ozi kpọta ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn. Aga m edokwasịkwa ocheeze ya nʼelu nkume ndị a m zoro nʼebe a, ọ ga-agbasa ụlọ ndo nke ịbụ eze ya nʼelu ha.

11Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.