28Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha.
29“ ‘Nke a ga-abụrụ unu ihe ama nke ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ nʼebe a,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ka unu si otu a mara na mba m na-aba na m ga-emesi unu ike aghaghị iguzosi ike.’
30Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m arara Fero Hofra, eze Ijipt nyefee nʼaka ndị iro ya, bụ ndị na-achọ ndụ ya, dịka m si rara Zedekaya eze Juda, nyefee nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, bụ onye iro ahụ chọrọ ndụ ya.’ ”