16Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe, ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha. Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị, ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị, ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’
17Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị, ‘Fero eze Ijipt bụ naanị onye oke okwu. Lee, oge a kara aka nye ya efunarịla ya.’
18“Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, “otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị, na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri.
19Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ, unu ndị bi nʼIjipt, nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya.
20“Ijipt mara mma dịka nne ehi, ma ijiji nke si nʼakụkụ ugwu, na-abịa imegide ya.