14“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol. Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis. Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere, nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu.
15Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha? Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-akwada ha.
16Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe, ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha. Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị, ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị, ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’
17Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị, ‘Fero eze Ijipt bụ naanị onye oke okwu. Lee, oge a kara aka nye ya efunarịla ya.’
18“Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, “otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị, na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri.