Jeremaya 46

“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol. Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis. Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere, nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu.

Jeremiah 46:14 (UKJV) Declare all of you in Egypt, and publish in Migdol, and publish in Noph and in Tahpanhes: say all of you, Stand fast, and prepare you; for the sword shall devour round about you.

12Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị. Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị. Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya; ha abụọ na-adakwa nʼala.”

13Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha.

14“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol. Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis. Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere, nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu.

15Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha? Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-akwada ha.

16Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe, ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha. Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị, ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị, ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.