Jeremaya 46

Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị. Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị. Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya; ha abụọ na-adakwa nʼala.”

Jeremiah 46:12 (UKJV) The nations have heard of your shame, and your cry has filled the land: for the mighty man has stumbled against the mighty, and they are fallen both together.

10Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya. Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya, e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu, nke dị nso osimiri Yufretis.

11“Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya, gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke. Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile, nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị.

12Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị. Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị. Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya; ha abụọ na-adakwa nʼala.”

13Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha.

14“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol. Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis. Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere, nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.