25Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi.
26Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
27“Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Adakwala mba, gị Izrel. Nʼihi na lee, aghaghị m ịzọpụta gị site nʼebe dị anya nke e mere ka ị gaa biri. Aga m azọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site nʼala ebe e mere ka ha gbapụ ọsọ gaa biri. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo, na-atụghị egwu ọbụla. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ọ tụọ ụjọ.
28Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, nʼihi na anọnyeere m gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “A sịkwarị na m ebibie mba ndị ahụ niile nke m mere ka ị gaa biri nʼetiti ha kpamkpam, agaghị m ebibi gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị, ma ọ ga-abụ site nʼụzọ ikpe ikpe ziri ezi. Agakwaghị m ahapụ inye gị ahụhụ i kwesiri ịnata.”