Jeremaya 49

“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”

Jeremiah 49:13 (UKJV) For I have sworn by myself, says the LORD, that Bozrah shall become a desolation, a reproach, a waste, and a curse; and all the cities thereof shall be perpetual wastes.

11‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ. Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ”

12Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.”

13“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”

14Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị. E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Chịkọtaanụ onwe, megide ya. Bilikwanụ maka ibu agha!”

15Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche, ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.