Jeremaya 49

Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị. E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Chịkọtaanụ onwe, megide ya. Bilikwanụ maka ibu agha!”

Jeremiah 49:14 (UKJV) I have heard a rumour from the LORD, and an ambassador is sent unto the heathen, saying, Gather all of you together, and come against her, and rise up to the battle.

12Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.”

13“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”

14Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị. E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Chịkọtaanụ onwe, megide ya. Bilikwanụ maka ibu agha!”

15Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche, ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ.

16Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu, na nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu, gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya. A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.