Jeremaya 49

Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan. Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi, nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ, nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.

Jeremiah 49:8 (UKJV) Flee all of you, turn back, dwell deep, O inhabitants of Dedan; for I will bring the calamity of Esau upon him, the time that I will visit him.

6“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

7Nke dịrị Edọm: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman? Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta? Amamihe ha o reela ure?

8Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan. Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi, nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ, nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.

9Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole? Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị, ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ?

10Ma aga m agba Ịsọ ọtọ. Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile ka ọ ghara izobe onwe ya. Ụmụ ya na ndị ikwu ya, tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi. Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.