Jeremaya 49

Nke dịrị Edọm: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman? Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta? Amamihe ha o reela ure?

Jeremiah 49:7 (UKJV) Concerning Edom, thus says the LORD of hosts; Is wisdom no more in Teman? is counsel perished from the prudent? is their wisdom vanished?

5Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu mee ka oke egwu bịakwasị gị,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya, “A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu. Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ.

6“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

7Nke dịrị Edọm: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman? Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta? Amamihe ha o reela ure?

8Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan. Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi, nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ, nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.

9Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole? Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị, ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.