Jeremaya 5

“Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam.

Jeremiah 5:18 (UKJV) Nevertheless in those days, says the LORD, I will not make a full end with you.

16Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe; ha niile bụkwa ndị dike nʼagha.

17Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere. Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu. Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu. Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike, bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.

18“Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam.

19Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’

20“Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya, kwusaa ya na Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.