Jeremaya 5

Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche, unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ, na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe.

Jeremiah 5:21 (UKJV) Hear now this, O foolish people, and without understanding; which have eyes, and see not; which have ears, and hear not:

19Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’

20“Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya, kwusaa ya na Juda.

21Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche, unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ, na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe.

22Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị, o kwesighị ka unu tụọ m egwu?” “O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m? Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere. Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe. Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya. Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.

23Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe. Ha atụgharịala wezuga onwe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.