24Ha adịghị asị onwe ha, ‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị, onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya, ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’
25Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka. Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu.
26“E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m, ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya, dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.
27Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya, ụlọ ndị dị otu a jupụtara nʼaghụghọ. Nʼihi nke a, ha ghọrọ ndị ọgaranya na ndị dị ike,
28ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ. Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ; ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi. Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna; ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha.