Jeremaya 50

Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha. Kụkapunụ ọba ya niile, tụkọtanụ ha ọnụ dịka akpa ọka dị ukwuu, nke atụkọtara nʼelu ibe ha. Bibienụ ya kpamkpam, ka ihe ọbụla ghakwara ịfọdụrụ ya.

Jeremiah 50:26 (UKJV) Come against her from the utmost border, open her storehouses: cast her up as heaps, and destroy her utterly: let nothing of her be left.

24Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn; ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị. A chọtala gị, jidekwa gị, nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha.

25Onyenwe anyị emegheela ụlọakụ ngwa agha ya, site nʼime ya wepụta ngwa agha nke ọnụma ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nwere ọrụ ọ ga-arụ nʼala Babilọn.

26Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha. Kụkapunụ ọba ya niile, tụkọtanụ ha ọnụ dịka akpa ọka dị ukwuu, nke atụkọtara nʼelu ibe ha. Bibienụ ya kpamkpam, ka ihe ọbụla ghakwara ịfọdụrụ ya.

27Gbuonụ ụmụ oke ehi ya niile, ka ha niile gaa nʼebe ụlọ igbu anụ Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ụbọchị ahụ a kara aka banyere ha abịala, bụ oge a ga-eji taa ha ahụhụ.

28Geenụ ntị nʼihe ndị na-agbalaga na-ekwu, bụ ndị si na Babilọn na-agbapụ ọsọ. Ha na-ekwusa na Zayọn otu Onyenwe anyị Chineke anyị si bọọ ọbọ, otu o si abọ ọbọ nʼihi ụlọnsọ ukwu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.