28Geenụ ntị nʼihe ndị na-agbalaga na-ekwu, bụ ndị si na Babilọn na-agbapụ ọsọ. Ha na-ekwusa na Zayọn otu Onyenwe anyị Chineke anyị si bọọ ọbọ, otu o si abọ ọbọ nʼihi ụlọnsọ ukwu ya.
29“Kpọkọtanụ ndị na-agba ụta maka imegide Babilọn, bụ ndị niile na-agba ụta. Maanụ ụlọ ikwu, gbaa ya gburugburu; unu ekwela ka onye ọbụla si nʼime ya gbapụ. Kwụghachi ya ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, dịka ihe niile ahụ o mere si dị meenụ ya otu ahụ. Nʼihi na o buliela onwe ya elu megide Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nke Izrel.
30Nʼihi ya, ụmụ okorobịa ya ga-ada nʼokporoụzọ ama niile. A ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
31“Lee, edoola m onwe m imegide gị, gị onye nganga.” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya. “Nʼihi na ụbọchị gị abịala, bụ oge ahụ a ga-ata gị ahụhụ.
32Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa, ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa. Aga m esunye obodo ya niile ọkụ, nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.”