Jeremaya 50

Ma Onye mgbapụta ha dị ike. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya. Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha, ime ka ala ha nweekwa izuike, ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike.

Jeremiah 50:34 (UKJV) Their Redeemer is strong; the LORD of hosts is his name: he shall thoroughly plead their cause, that he may give rest to the land, and trouble the inhabitants of Babylon.

32Onye nganga ahụ ga-asọ ngọngọ daa, ma o nweghị onye ga-enyere ya aka ka o bilitekwa. Aga m esunye obodo ya niile ọkụ, nke ga-erechapụ ndị niile gbara ya gburugburu.”

33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “A na-emegbu nnọọ ndị Izrel, nʼotu aka ahụkwa, ndị Juda. Ndị dọtara ha nʼagha jidesiri ha aka ike. Ha adịghị ahapụ ha ka ha laa.

34Ma Onye mgbapụta ha dị ike. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụkwa aha ya. Ọ ga-eji ike ya niile kpepụta ọnụ ha, ime ka ala ha nweekwa izuike, ma meekwa ka ndị bi na Babilọn ghara inwe izuike.

35“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “na ndị ahụ niile bi na Babilọn ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe.

36Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile. Ha ga-aghọ ndị nzuzu. Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha. Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.