35“Mma agha ga-ebili megide ndị Babilọn niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “na ndị ahụ niile bi na Babilọn ma megidekwa ndịisi ọchịchị niile na ndị ahụ niile maara ihe.
36Mma agha ga-ebili megide ndị amụma ụgha ha niile. Ha ga-aghọ ndị nzuzu. Mma agha ga-ebili megide ndị bụ dike nʼagha. Obi ha ga-ejupụtakwa nʼoke egwu.
37Mma agha ga-ebili megide ịnyịnya ha, na ụgbọ agha ha, na ndị mba ọzọ niile nọ nʼetiti ha. Ha ga-aghọkwa ndị inyom. Mma agha ga-ebilikwa megide akụ ha niile. A ga-alụta ha niile nʼagha.
38Okpomọkụ ga-abịakwasị mmiri ha niile mee ka ha taa. Nʼihi na ala ha bụ ala arụsị: arụsị ha niile ga-ayịkwa ara nʼihi oke egwu nke ga-abịakwasị ha.
39“Nʼihi ya, ọ bụ ụmụ anụmanụ nke ọzara, na nkịta ọhịa ga-ebi nʼebe ahụ. Ikwighịkwighị ga-ebikwa nʼebe ahụ. Mmadụ ọbụla agaghị ebikwa nʼime ya ọzọ. O nweghị onye ga-ebikwa nʼime ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.