Jeremaya 50

Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ, nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”

Jeremiah 50:44 (UKJV) Behold, he shall come up like a lion from the swelling of Jordan unto the habitation of the strong: but I will make them suddenly run away from her: and who is a chosen man, that I may appoint over her? for who is like me? and who will appoint me the time? and who is that shepherd that will stand before me?

42Ha ji ọtụtụ ụta na ùbe; ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-enweghị obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Babilọn.

43Eze Babilọn nụrụ akụkọ banyere ude ha, akụkọ mere ka ike gwụrụ aka ya abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu ejidela ya, ihe mgbu dịka nke nwanyị ime na-eme.

44Lee, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ, nʼotu ntabi anya ka m ga-esi nʼala ya chụpụ Babilọn. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”

45Nʼihi ya, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Babilọn, nụrụkwa ihe o zubere megide ala ndị Babilọn. A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ. Ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.

46Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda Babilọn, iti mkpu akwa ya ga-adakwa ụda nʼetiti mba niile dị iche iche.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.