6“Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu. Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha, mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile. Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta. Ha echefuokwala ebe izuike nke ha.
7Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha. Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha, na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’
8“Sinụ na Babilọn gbalaga; sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ, dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ.
9Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu, ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha. Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya; ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha. Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba. Ha agaghị agba aka lọta.
10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha. Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.