Jeremaya 51

“ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè. Ka anyị kwupụta ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’

Jeremiah 51:10 (UKJV) The LORD has brought forth our righteousness: come, and let us declare in Zion the work of the LORD our God.

8Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya. Kwasierenụ ya akwa ike. Wetanụ ọgwụ tee ya, ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma.

9“ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn, ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta. Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị, nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe. Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’

10“ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè. Ka anyị kwupụta ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’

11“Mụọnụ ọnụ àkụ unu; bulienụ ọta unu! Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia, nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi. Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ, ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ.

12Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn. Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya. Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha, nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo, bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.