Jeremaya 51

“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.

Jeremiah 51:24 (UKJV) And I will render unto Babylon and to all the inhabitants of Chaldea all their evil that they have done in Zion in your sight, says the LORD.

22gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị, gị ka m ga-eji tipịa agadi nwoke na okorobịa, gị ka m ga-eji tipịa okorobịa na nwaagbọghọ,

23gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya, gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya; gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze.

24“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.

25“Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ.

26A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ, maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla, nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.