20“Ị bụ mkpọrọ osisi m ji ebu agha, na ngwa agha m ga-eji gaa nʼihu agha. Gị ka m ga-eji tipịa mba niile dị iche iche, gị ka m ga-eji laa alaeze niile nʼiyi;
21gị ka m ga-eji tipịa ịnyịnya na onye na-agba ya, gị ka m ga-eji tipịa ụgbọ agha na onye na-anya ya;
22gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị, gị ka m ga-eji tipịa agadi nwoke na okorobịa, gị ka m ga-eji tipịa okorobịa na nwaagbọghọ,
23gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya, gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya; gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze.
24“Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.