Jeremaya 51

Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.” Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru. Jerusalem na-ekwukwa sị, “Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.”

Jeremiah 51:35 (UKJV) The violence done to me and to my flesh be upon Babylon, shall the inhabitant of Zion say; and my blood upon the inhabitants of Chaldea, shall Jerusalem say.

33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka, nʼoge a na-azọcha ya. Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.”

34“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị, o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya. O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya. O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ, jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya. Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.

35Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.” Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru. Jerusalem na-ekwukwa sị, “Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.”

36Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị, bọtakwara gị ọbọ. Aga m emekwa ka osimiri taa, meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa.

37Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa, bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.