37Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa, bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa.
38Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm, ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara.
39Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha, aga m edo oriri nʼihu ha. Aga m eme ka ha ṅụbiga mmanya oke, si otu a mee ka ha jiri oke ịchị ọchị tie mkpu ọṅụ. Nʼikpeazụ, ha ga-arahụ ụra ebighị ebi, nke ha na-agaghị esite na ya bilie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
40“Aga m akpụdata ha, dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka ebule na mkpi.
41“Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha, jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha. Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile!