62Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’
63Mgbe ị gụsịrị ihe dị nʼakwụkwọ a, kegide ya nkume, tụnye ya nʼetiti iyi ukwu Yufretis.
64Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka Babilọn ga-esi mikpuo. Ọ gaghị ebilikwa ọzọ, nʼihi ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ya. Ndị ya ga-adakwa.’ ” Ebe a ka okwu Jeremaya niile gwụrụ.