24Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ.
25O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom asaa na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii bụ ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ.
26Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla.
27Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile. Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
28Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ahụ Nebukadneza mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ. Nʼafọ nke asaa nke ọchịchị ya, puku atọ ndị Juu na iri abụọ na atọ, 3,023.