Jeremaya 6

Ha na-ekechi ọnya ndị m, dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’ mgbe udo na-adịghị.

Jeremiah 6:14 (UKJV) They have healed also the hurt of the daughter of my people slightly, saying, Peace, peace; when there is no peace.

12A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ. A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ, mgbe m setịpụrụ aka m megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

13“Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.

14Ha na-ekechi ọnya ndị m, dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’ mgbe udo na-adịghị.

15O nwere ụzọ omume ha ndị a rụrụ arụ si eme ha ihere? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị. Nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere! Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada. Ha ga-asọ ngọngọ mgbe m tara ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

16Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya. Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ. Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya. Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike. Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.