Jeremaya 6

A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ. A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ, mgbe m setịpụrụ aka m megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Jeremiah 6:12 (UKJV) And their houses shall be turned unto others, with their fields and wives together: for I will stretch out my hand upon the inhabitants of the land, says the LORD.

10Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị? Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu? Ntị ha emechiela ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla. Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ; nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.

11Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi, apụghị m ịnagide ya nʼime m. “Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ; wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ. Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ, ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi.

12A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ. A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ, mgbe m setịpụrụ aka m megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

13“Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.

14Ha na-ekechi ọnya ndị m, dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’ mgbe udo na-adịghị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.