17Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị, ‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’ Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’
18Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile; lezienụ anya, unu ndị akaebe niile, ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha.
19Nụrụ, gị ụwa, lee, ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi, nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile, nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m.
20Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme? Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme? Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile. Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.”
21Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe. Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya; otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.”