Jeremaya 6

Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem, ka m ghara ịgbakụta gị azụ, mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.”

Jeremiah 6:8 (UKJV) Be you instructed, O Jerusalem, lest my soul depart from you; lest I make you desolate, a land not inhabited.

6Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru, “Gbutusienụ osisi niile, wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem. A ghaghị ịta obodo a ahụhụ, nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya.

7Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta. Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya; ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile.

8Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem, ka m ghara ịgbakụta gị azụ, mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.”

9Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma, dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị; werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile, dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.”

10Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị? Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu? Ntị ha emechiela ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla. Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ; nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.