9“ ‘Unu ga-aga nʼihu na-ezu ohi, na-egbu mmadụ ibe unu, na-akwa iko, ma na-eji chi ndị ọzọ na-aṅụ iyi? Unu ga-anọgide na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, ma na-agbaso chi ndị ọzọ unu na-amaghị?
10Unu ga-emecha bịa guzo nʼihu m nʼụlọnsọ a, nke a kpọkwasịrị aha m, na-asị, “Anyị nọ na nchekwa,” ọ bụ ịnọ na nchekwa maka ime ihe arụ niile ndị a?
11Ọ pụtara na ụlọ a, nke a kpọkwasịrị aha m aghọọla ogige nye ndị ohi? Ma anọkwa m ya na-ele unu anya, ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12“ ‘Otu ọ dị, biko, Jeruonụ ebe ahụ dị na Shaịlo, ebe ahụ m buru ụzọ mee ka ọ bụrụ ebe a kpọkwasịrị aha m, ka unu chọpụta ihe m mere ya nʼihi ajọ omume ndị m, ụmụ Izrel.
13Mgbe unu nọ na-eme ihe ndị a niile, ka Onyenwe anyị kwupụtara, agwara m unu okwu mgbe mgbe, ma unu jụrụ ige ntị. Akpọrọ m unu oku, ma unu jụrụ ịza.