Jeremaya 7

“ ‘Unu ga-aga nʼihu na-ezu ohi, na-egbu mmadụ ibe unu, na-akwa iko, ma na-eji chi ndị ọzọ na-aṅụ iyi? Unu ga-anọgide na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, ma na-agbaso chi ndị ọzọ unu na-amaghị?

Jeremiah 7:9 (UKJV) Will all of you steal, murder, and commit adultery, and swear falsely, and burn incense unto Baal, and walk after other gods whom all of you know not;

7mgbe ahụ, aga m ekwere ka unu biri nʼebe a, nʼala a m nyere nna nna unu ha, ruo mgbe ebighị ebi.

8Ma lee, ihe unu na-eme ugbu a bụ ịtụkwasị uche unu nʼokwu aghụghọ nke na-enweghị isi.

9“ ‘Unu ga-aga nʼihu na-ezu ohi, na-egbu mmadụ ibe unu, na-akwa iko, ma na-eji chi ndị ọzọ na-aṅụ iyi? Unu ga-anọgide na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, ma na-agbaso chi ndị ọzọ unu na-amaghị?

10Unu ga-emecha bịa guzo nʼihu m nʼụlọnsọ a, nke a kpọkwasịrị aha m, na-asị, “Anyị nọ na nchekwa,” ọ bụ ịnọ na nchekwa maka ime ihe arụ niile ndị a?

11Ọ pụtara na ụlọ a, nke a kpọkwasịrị aha m aghọọla ogige nye ndị ohi? Ma anọkwa m ya na-ele unu anya, ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.