13Mgbe unu nọ na-eme ihe ndị a niile, ka Onyenwe anyị kwupụtara, agwara m unu okwu mgbe mgbe, ma unu jụrụ ige ntị. Akpọrọ m unu oku, ma unu jụrụ ịza.
14Nʼihi ya, ihe ahụ m mere na Shaịlo ka m ga-emekwa ọzọ megide ụlọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. E, aga m eme ya megide ụlọnsọ ukwu ahụ unu na-atụkwasị obi unu nʼime ya, ụlọnsọ ukwu ahụ m nyere unu na nna nna unu ha.
15A ga-esite nʼihu m wezuga unu, tufuo unu, dịka m wezugara ma tufukwaa ụmụnna unu, bụ ndị Ifrem.’
16“Ya mere, unu ekperela m ekpere nʼihi ndị a; unu atụfula oge unu ịrịọ m arịrịọ nʼihi ha. Agaghị m ege ntị nʼekpere na arịrịọ unu.
17Ọ bụ na unu adịghị ahụ ihe na-eme nʼobodo niile nke Juda, na ihe ha na-eme nʼokporoụzọ niile nke Jerusalem?