18Ụmụ na-achịkọta nkụ nke nna ha ji emenye ọkụ, ebe nne ha na-eghe achịcha ha na-eche nʼihu Eze nwanyị mbara Eluigwe. Ha na-awụpụrụ chi ndị ọzọ mmanya nʼihi ịkpasu m iwe.
19Ọ bụ m ka ha na-akpasu iwe? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ bụghị onwe ha ka ha na-emesi ike, ka ihe ihere mee ha?
20“ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Iwe m na ọnụma m ka a ga-awụkwasị nʼebe a, nʼelu ndị mmadụ, na anụmanụ, na osisi dị nʼọhịa, na mkpụrụ nke ala ubi. Ọ ga-ere ọkụ ma agaghị emenyụ ya.
21“ ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Gaanụ nʼihu, tụkwasịnụ aja nsure ọkụ unu nʼelu aja unu ndị ọzọ niile. Riekwanụ anụ ndị a nʼonwe unu.
22Nʼihi na mgbe m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha, gwa ha okwu, e nyeghị ha naanị iwu maọbụ gwa ha okwu banyere ịchụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ.