22Nʼihi na mgbe m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha, gwa ha okwu, e nyeghị ha naanị iwu maọbụ gwa ha okwu banyere ịchụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ.
23Ma iwu m nyere ha bụ nke a, ruberenụ m isi, aga m abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị nke m. Bienụ ndụ nʼiwu niile m nyere unu, ka ihe gaara unu nke ọma.
24Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe ndị ahụ m nyere nʼiwu. Kama ha gbasoro ọchịchọ ọjọọ nke obi rụrụ arụ ha. Kama ịga nʼihu, ha daghachiri azụ.
25Site na mgbe nna nna unu ha hapụrụ ala Ijipt, esepụbeghị m aka izitere unu ndị amụma bụ ndị ohu m.
26Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’