Jeremaya 7

Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’

Jeremiah 7:26 (UKJV) Yet they hearkened not unto me, nor inclined their ear, but hardened their neck: they did worse than their fathers.

24Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe ndị ahụ m nyere nʼiwu. Kama ha gbasoro ọchịchọ ọjọọ nke obi rụrụ arụ ha. Kama ịga nʼihu, ha daghachiri azụ.

25Site na mgbe nna nna unu ha hapụrụ ala Ijipt, esepụbeghị m aka izitere unu ndị amụma bụ ndị ohu m.

26Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’

27“Mgbe ị gwara ha ihe ndị a niile, ha agaghị ege ntị. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ ha oku ha agaghị aza.

28Ya mere, ihe ndị a ka ị ga-agwa ha, ‘Nke a bụ mba na-enwebeghị oge ha ji rubere Onyenwe anyị Chineke ha isi. O nwebekwaghị oge ọbụla ha ji nabata ịdọ aka na ntị ya. Eziokwu ọbụla adịghịkwa; okwu ọnụ ha bụ naanị ụgha ụgha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.