8“ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ, nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,” ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri?
9A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe; a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya. Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị, ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?
10Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha, werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ. Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
11Ha na-ekechi ọnya ndị m dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,” mgbe udo na-adịghị.
12Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị; nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere. Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada; ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.