10Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha, werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ. Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
11Ha na-ekechi ọnya ndị m dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,” mgbe udo na-adịghị.
12Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị; nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere. Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada; ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
13“ ‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị, maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha. Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ. A ga-anapụkwa ha ihe niile m nyere ha.’ ”
14Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala? Kwakọtaanụ ihe unu niile. Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nọdụ nʼebe ahụ nwụọ! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ. O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ, nʼihi na anyị emehiela megide ya.