Jeremaya 8

Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’

Jeremiah 8:3 (UKJV) And death shall be chosen rather than life by all the residue of them that remain of this evil family, which remain in all the places where I have driven them, says the LORD of hosts.

1“ ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem.

2A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi.

3Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’

4“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ? Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?

5Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.