3Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
4“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ? Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?
5Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị.
6Aṅaala m ntị, ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta. O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị, “Gịnị bụ ihe a m mere?” Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya, dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha.
7Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.