Jeremaya 9

Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.

Jeremiah 9:13 (UKJV) And the LORD says, Because they have forsaken my law which I set before them, and have not obeyed my voice, neither walked therein;

11“Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi. Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri. Aga m ekposa obodo niile nke Juda. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.”

12Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?

13Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.

14Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.”

15Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.