8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ nọ nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla.”
9Ekwensu zara Onyenwe anyị sị, “Job ọ na-atụ Chineke egwu nʼefu?
10Ọ bụ na ị gbaghị Job na ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu nʼakụkụ niile? I gọziela ọrụ aka ya, nke mere na igwe ewu na atụrụ ya na igwe ehi ya jupụtara ebe niile.
11Ngwa, setịpụ aka gị metụ ihe niile o nwere aka, ka ị hụ ma ọ gaghị abụ gị ọnụ.”
12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekwensu sị ya, “Lee Job, jiri niile o nwere mee ihe ọbụla ị chọrọ, kama emetụkwala ndụ ya aka.” Emesịa, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ.