Job 1

Ngwa, setịpụ aka gị metụ ihe niile o nwere aka, ka ị hụ ma ọ gaghị abụ gị ọnụ.”

Job 1:11 (UKJV) But put forth yours hand now, and touch all that he has, and he will curse you to your face.

9Ekwensu zara Onyenwe anyị sị, “Job ọ na-atụ Chineke egwu nʼefu?

10Ọ bụ na ị gbaghị Job na ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu nʼakụkụ niile? I gọziela ọrụ aka ya, nke mere na igwe ewu na atụrụ ya na igwe ehi ya jupụtara ebe niile.

11Ngwa, setịpụ aka gị metụ ihe niile o nwere aka, ka ị hụ ma ọ gaghị abụ gị ọnụ.”

12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekwensu sị ya, “Lee Job, jiri niile o nwere mee ihe ọbụla ị chọrọ, kama emetụkwala ndụ ya aka.” Emesịa, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ.

13Otu ụbọchị, mgbe ụmụ Job ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwanyị zukọrọ iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼụlọ nwanne ha nwoke nke okenye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.