Job 1

Otu ụbọchị ụmụ Chineke bịara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị ma ekwensu sonyekwara ha bịa.

Job 1:6 (UKJV) Now there was a day when the sons of God came to present themselves before the LORD, and Satan came also among them.

4Ụmụ ya ndị ikom na-eme mmemme oriri na ọṅụṅụ nʼụbọchị ọmụmụ ha nʼụlọ ha, nke ọbụla nʼime ya nʼusoro. Mgbe ha na-eme nke a, ha na-akpọkwa ụmụnne ha ndị nwanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụkwaa.

5Mgbe oge mmemme ndị ahụ gwụsịrị, Job na-akpọkọta ụmụ ya doo ha nsọ. Nʼisi ụtụtụ ya, ọ na-achụ aja nsure ọkụ nʼihi onye ọbụla nʼetiti ụmụ ya. Echiche ya bụ, “Ma eleghị anya, ụmụ ya emehiela kọchaa Chineke nʼime obi ha.” Nke a bụ ihe Job na-eme mgbe niile.

6Otu ụbọchị ụmụ Chineke bịara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị ma ekwensu sonyekwara ha bịa.

7Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara Onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”

8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ nọ nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.