16Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta maka na ọ dịghị onye ajọ omume ọbụla pụrụ ịbịa nʼihu ya.
17Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m. Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị.
18Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro, amatala m na ikpe agaghị ama m.
19Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo? Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ.
20“Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke, mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.