17Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m. Kwerenụ ka ihe m na-ekwu baa unu ntị.
18Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro, amatala m na ikpe agaghị ama m.
19Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo? Ọ bụrụ na o nwere, aga m emechi ọnụ m ma nwụọ.
20“Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke, mgbe ahụ agaghị m ezo onwe m nʼihu gị.
21Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ. Kwụsị ime ka oke egwu gị mee ka m maa jijiji.