Job 2

Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.”

Job 2:5 (UKJV) But put forth yours hand now, and touch his bone and his flesh, and he will curse you to your face.

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.”

4Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya.

5Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.”

6Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.”

7Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.