Job 2

Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya.

Job 2:4 (UKJV) And Satan answered the LORD, and said, Skin for skin, yea, all that a man has will he give for his life.

2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.”

4Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya.

5Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.”

6Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.